Aisaia 17:11-13 Bible Nso (IGBOB)

11. n'ubọchi ọkukú-gi i nāb͕a ya ogige buruburu, ọ bu kwa n'ututu ka i nēme ka nkpuru-gi ma ifuru: ma obo-ihe ka owuwe-ihe-ubi gābu n'ubọchi ọria na ihe-nb͕u nādighi-agwọta.

12. Ahuhu! ọ bu ùzù ọtutu ndi, dika ùzù nke oké osimiri ka ha nātu ùzù; ọ bu kwa nkpọtu nke mba di iche iche, dika nkpọtu nke ọtutu miri ka ha nākpọtu.

13. Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n'ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n'iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n'iru oké ifufe.

Aisaia 17