Aisaia 15:7-9 Bible Nso (IGBOB)

7. N'ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara, na ihe ha kpakọbaworo, n'ofè iyi osisi willow ka ha gēbulaga ha.

8. N'ihi na iti-nkpu adazuwo udà n'ókè-ala Moab buruburu; n'Eglaim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo, ọ bu kwa na Bia-ilim ka ákwá ọ nākwasi ike daruworo.

9. N'ihi na miri Dimon juputara n'ọbara: n'ihi na M'gātukwasi kwa n'aru Dimon ihe ọzọ, ndi Moab nke b͕apuru ab͕apu ka M'gātukwasiri ọdum, tukwasi-kwa-ra ndi ala-ha fọduru.

Aisaia 15