7. Uwa nile ezuwo ike, di jū: ha etiwawo nkpu ọṅù.
8. Ọbuná osisi fir aṅuriwo ọṅu megide gi, ha na osisi cedar nke Lebanon, si, Site na mb͕e i dinaworo, onye-nb͕utu adighi-arigota megide ayi.
9. Ala-mọ site n'okpuru emeworo gi nkpatu izute gi n'ọbibia-gi: ọ nākpọtere gi ndi nādighi ndu, bú nkpi nile nke uwa; o mewo ka eze nile nke mba nile si n'oche-eze-ha bilie.
10. Ha nile gāza, si gi, Gi onwe-gi kwa, èmewo ka i ghara ídi ike dika ayi? ì ghọwo onye yiri ayi?
11. Emewo ka nbili-elu-gi ridarue ala-mọ, ya na olu une-gi nile: n'okpuru gi ka ab͕asaworo ikpuru, ihe-nkpuchi-gi bu kwa ikpuru.