18. Eze nile nke mba nile, ọbuná ha nile, edinawo n'ala nime nsọpuru, onye ọ bula n'ulo-ya.
19. Ma gi onwe-gi, esiwo n'ílì-gi tupu gi dika alaka nke bu ihe-árú, yiri ndi eb͕uru eb͕u dika uwe, bú ndi ejiworo mma-agha dupú, ndi nāridaru nkume nke olùlù; dika ozu azọrọ ukwu.
20. Gi na ha agaghi-abu otù n'olìlì, n'ihi na ala-gi ka i bibiworo, ndi-gi ka i b͕uworo; nkpuru nke ndi nēme ihe ọjọ, agaghi-akpọ aha-ha rue mb͕e ebighi-ebi.
21. Dozierenu umu-ya ebe-ob͕ub͕u n'ihi ajọ omume nke ndi bu nna-ha; ka ha we ghara ibili, nweta uwa, me ka elu-uwa dum madu bi juputa n'obodo.
22. M'gēbili kwa megide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēbipu kwa na Babilon aha na ndi fọduru, na umu na umu umu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
23. M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ihe-nnweta nke ebinta, na ọdọ-miri ọdọ-miri; M'gewere kwa aziza, bú nkpochapu, zachapu ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.
24. Jehova nke usu nile nke ndi-agha aṅuwo iyi, si, N'ezie dika M'chèworo, otú a ka ọ gādi; na dika M'zubeworo, nke ahu gēguzosi ike:
25. na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya.
26. Nka bu nzube ahu nke anēzube n'elu uwa nile: nka bu kwa aka ahu nke anēseti n'aru mba nile.
27. N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo; ònye gēmebi kwa ya? aka-Ya esetiwo kwa; ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu.
28. N'arọ ọnwu eze, bú Ehaz, ka ibu a di.
29. Aṅurila ọṅu, gi Filistia, ka i ra, n'ihi na anyajiwo ndele nke nēti gi-ri: n'ihi na ihe nke gēsi na nkpọrọgwu agwọ puta bu ubí, nkpuru-ya gābu kwa agwọ yiri ọku nēfe efe.
30. Ndi bu ọkpara nke ndi nēnweghi ike gāzù kwa onwe-ha dika aturu, ndi-ob͕eye gāmakpu kwa na ntukwasi-obi: ma M'gēme ka nkpọrọgwu-gi nwua site n'oké unwu, ọ bu kwa ndi-gi fọduru ka o gēb͕u.
31. Kwasie ákwá ike, gi ọnu-uzọ-ama; tie nkpu, gi obodo; i b͕azewo, Filistia, ka i ra; n'ihi na n'Ugwu ka anwuru-ọku si bia, ọ dighi kwa onye ọ bula nēguzo iche na mb͕e-ya nile akara àkà.