1. N'ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n'aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n'ala-ha: ọbìa gārapara kwa n'aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n'otù.
2. Ndi nile di iche iche gēkuru kwa ha, me ka ha biarue ọnọdu-ha: ulo Israel gēketa kwa ha n'ala Jehova ibu ndi-orù na ibu ndinyom nēje ozi: ha gāghọ kwa ndi nādọta ndi nādọta ha-ri n'agha n'agha; ha gēnwe kwa ike n'aru ndi nāchi ha-ri n'ihe-ike.
3. Ọ gēru kwa, n'ubọchi Jehova gēme ka i zu ike pua n'ihe-nb͕u-gi, na n'ihe-nwute-gi, na n'òfùfè ahu siri ike nke emere ka i fè nime ya,