Aisaia 11:12-16 Bible Nso (IGBOB)

12. Ọ gēbuli-kwa-ra mba nile ọkọlọtọ, we chikọta ndi Israel achupuru achupu, ndi Juda b͕asara ab͕asa ka Ọ gēsi na nkuku anọ nke uwa kpọkọputa kwa.

13. Ekworo nke Efraim gēwezuga kwa onwe-ya, agēbipu kwa ndi nākpab͕u Juda: Efraim agaghi-ekwoso Juda ekworo, Juda agaghi-akpab͕u kwa Efraim.

14. Ha gēfedakwasi n'ubu ndi Filistia n'Ọdida-anyanwu; ha abua gādi n'otù luta ihe umu Iru-anyanwu n'agha: n'aru Edom na Moab ka ha ganēseti aka-ha; umu Amon ganānu kwa olu-ha.

15. Jehova gēwezuga ire oké osimiri nke Ijipt ka ebibie ya; Ọ gēji kwa okpom-ọku nke ifufe-Ya feghari aka-Ya n'elu Osimiri, tiputa ya iyi asa, me ka madu zọ ya ukwu n'akpukpọ-ukwu.

16. Uzọ atuliri atuli gādi-kwa-ra ndi-Ya fọduru, bú ndi gāfọdu, site n'Asiria; dika o si diri Israel n'ubọchi o siri n'ala Ijipt rigoputa.

Aisaia 11