Aisaia 11:1-5 Bible Nso (IGBOB)

1. Ome gēsi kwa n'ogwe-osisi Jesi puta, otù alaka nke sitere na nkpọrọgwu-ya gāmi kwa nkpuru:

2. Mọ nke Jehova gēnwe kwa ọnọdu-Ya n'aru ya, bú Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike, Mọ nke ihe-ọmuma na egwu Jehova;

3. ọzọ, ihe nātọ ya utọ bu egwu Jehova: ọ bughi kwa dika anya-ya abua si ahu ka ọ gēkpe ikpe, ọ bughi kwa dika nti-ya abua si anu ka ọ gāba nba:

4. kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n'obi n'uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua.

5. Ezi omume gābu kwa ihe-ọkiké ume-Ya, ikwesi-ntukwasi-obi gābu kwa ihe-ọkiké úkwù-Ya.

Aisaia 11