Aisaia 10:9-15 Bible Nso (IGBOB)

9. Kalno, ọ̀ dighi ka Kakemish? ma-ọbu Hemat, ọ̀ dighi ka Apad? ma-ọbu Sameria, ọ̀ dighi ka Damaskọs?

10. Dika akam chọtaworo ala-eze nile nke ihe-efu, ndi arusi-ha apiri api kariri nke Jerusalem, kari kwa nke Sameria;

11. dika m'meworo Sameria, me kwa ihe-efu-ya nile, ọ̀ bughi otú a ka m'gēme Jerusalem, me kwa ihe-efu-ya nile?

12. Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n'ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M'gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya.

13. N'ihi na ọ siwo, Site n'ike akam ka m'meworo ya, na site n'amam-ihem; n'ihi na enwerem nghọta: m'we wezuga ókè ndi nile di iche iche, ọzọ, ihe-ha nke ejikereworo ka m'punara ha, m'we buda, dika onye di ike, ndi nānọdu n'ọche-eze;

14. akam achọtawo kwa àkù ndi nile di che iche dika akwu; na dika madu si achikọta àkwá arapuru arapu, otú a uwa nile ka mu onwem chikọtaworo: ma ọ dighi nke nēmeghari nkù, ma-ọbu nke nāsaghe ọnu, ma-ọbu nke nēbe ebe.

15. Anyu-ike, ọ̀ ga-egbu onwe ya n'aru onye ji ya eb͕u ihe? ma-ọbu mma-nkwọ, ọ̀ gēme onwe-ya uku megide onye nākwọ ya? dika agāsi na ndele gēfeghari ndi nēbuli ya, dika agāsi na nkpa-n'aka gēbuli onye nābughi osisi.

Aisaia 10