Aisaia 10:6-11 Bible Nso (IGBOB)

6. Imegide mba emeruru emeru ka M'nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M'nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n'agha, na iluta ihe-nluta n'agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.

7. Ma ya onwe-ya, ọ bughi otú a ka ọ nēzube, obi-ya kwa, ọ bughi otú a ka ọ nēchè; kama ikpochapu ekpochapu di n'obi-ya, ya na ibipu ọtutu mba.

8. N'ihi na ọ nāsi, Ndi-isim, hà nile abughi ndi-eze?

9. Kalno, ọ̀ dighi ka Kakemish? ma-ọbu Hemat, ọ̀ dighi ka Apad? ma-ọbu Sameria, ọ̀ dighi ka Damaskọs?

10. Dika akam chọtaworo ala-eze nile nke ihe-efu, ndi arusi-ha apiri api kariri nke Jerusalem, kari kwa nke Sameria;

11. dika m'meworo Sameria, me kwa ihe-efu-ya nile, ọ̀ bughi otú a ka m'gēme Jerusalem, me kwa ihe-efu-ya nile?

Aisaia 10