28. Ọ biakwasiwo Aiat, ọ gabigawo n'etiti Migron; na Mikmash ka ọ debeworo ihe-ya nile:
29. ha agabigawo uzọ-ngabiga; Geba bu ebe-inọ-ọnọdu-abali ayi gēnwe, ka ha kwuru: Rema nāma jijiji, Gibea nke Sọl ab͕alagawo.
30. Were olu-gi tisie nkpu ike, ada Galim! ṅa nti, gi Laisha! Éwù, Anatot nke ewedara n'ala!
31. Madmena awaghariwo; ndi bi na Gibim gēme ka ndi-ha laghachi n'ulo ọsọsọ.