Aisaia 10:22-25 Bible Nso (IGBOB)

22. N'ihi na ọ buru na ndi-gi, Israel, adi ka ájá oké osimiri, nání ndi fọduru nime ha gālata: nkpochapu ka akaworo àkà, nke nērubiga ókè n'ezi omume.

23. N'ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nēme n'etiti uwa nile.

24. N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Gi ndim nke bi na Zaion, atula egwu Asiria: ọ bu ezie na o ji ndele tie gi, weli kwa nkpa-n'aka-ya megide gi, otú Ijipt mere.

25. N'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, oké iwe ewe gwusia, iwem gēme kwa ka ha ka nká.

Aisaia 10