Abù Ọma 98:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di:Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.

4. Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile:Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.

5. Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma;Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma.

6. Chirinu opì na olu opì-ikeTisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova.

7. Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya;Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya;

8. Ka osimiri nile kua aka-ha;Ka ugwu tie nkpu ọṅù n'otù;

Abù Ọma 98