Abù Ọma 97:6-10 Bible Nso (IGBOB)

6. Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya,Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya.

7. Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè,Ndi nānya isi n'ihe-efu di iche iche:Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile.

8. Zaion nuru, we ṅuria,Umu-ndinyom Juda we tegharia egwu ọǹù;N'ihi ikpé-Gi nile, Jehova.

9. N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, bú Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile:Emewo ka I di elu nke-uku n'elu chi nile.

10. Unu ndi nāhu Jehova n'anya, kpọnu ihe ọjọ asì:Ọ nēdebe nkpuru-obi ndi-ebere-Ya;Ọ nānaputa ha n'aka ndi nēmebi iwu.

Abù Ọma 97