Abù Ọma 97:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Jehova bu eze; ka uwa tegharia egwu ọṅù;Ka ala bara uba nke di oké osimiri buruburu ṅuria.

2. Igwe-oji na oké ọchichiri di Ya buruburu:Ezi omume na ikpé ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya.

3. Ọku nāga n'iru Ya,Nēsure kwa ndi-nkpab͕u-Ya buruburu.

4. Àmùmà-Ya nile nyere elu-uwa dum madu bi ìhè:Uwa huru ya, o we gbue ya nb͕u.

5. Ugwu nile b͕azepuru dika wax n'iru Jehova,N'iru Onye-nwe uwa nile.

6. Elu-igwe gosiri ezi omume-Ya,Ndi nile di iche iche hu-kwa-ra ebube-Ya.

7. Ka ihere me ndi nile ndi nēfè arusi apiri api òfùfè,Ndi nānya isi n'ihe-efu di iche iche:Kpọnu isi ala nya Ya, unu chi nile.

Abù Ọma 97