6. Ebube na ima-nma di n'iru Ya:Ike na nma di n'ebe nsọ Ya.
7. Nyenu Jehova, unu ab͕uru nke ndi nile di iche iche,Nyenu Jehova nsọpuru na ike.
8. Nyenu Jehova nsọpuru aha-Ya:Butenu onyinye-inata-iru-ọma, bata n'ogige-Ya nile.
9. Kpọnu isi ala nye Jehova n'ima-nma nke idi-nsọ:Ka o nēb͕u unu nb͕u site n'iru Ya, unu elu-uwa nile.
10. Sinu n'etiti mba nile, Jehova bu eze:Ọzọ, elu-uwa dum madu bi nēguzosi ike, adighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya:Ọ gēkpe ndi nile di iche iche ikpe n'izi-ezi.
11. Ka elu-igwe ṅuria, ka uwa teghari kwa egwú ọṅù;Ka oké osimiri bib͕o, ya na ùjú-ya;