Abù Ọma 9:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu,Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà;

10. Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi;N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.

11. Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion:Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.

12. N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha:O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.

13. Merem amara, Jehova;Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì,Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu;

14. Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile:N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion,Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.

15. Mba nile ọzọ emikpuwo n'olùlù ha mere:N'ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha.

16. Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo:N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah

17. Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ,Bú mba nile ndi nēchezo Chineke.

Abù Ọma 9