2. M'gāṅuri ọṅu, obim gātọkwam utọ, nime Gi:M'gābùku aha-Gi abù ọma, Gi Onye kachasi ihe nile elu;
3. Mb͕e ndi-irom laghachiri azu,Su ngọngọ, si kwa n'iru Gi la n'iyì.
4. N'ihi na I kpewo ikpem ziri ezi na okwu-ikpem;I nọduru n'oche-eze, buru onye-ikpe nēme ezi omume.
5. I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n'iyì,I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi.
6. Ndi-iro agwusiwo, ha bu nkpọnkpọ ebe rue mb͕e ebighi-ebi;Ọzọ, obodo nile nke I ropuworo,Ncheta-ha, ọbuná nke obodo ahu, alawo n'yì.
7. Ma Jehova nānọdu dika eze rue mb͕e ebighi-ebi:O doziwo oche-eze-Ya ikpe ikpe.
8. Ya onwe-ya gēkpe uwa dum madu bi ikpe n'ezi omume,Ọ gēkpe ndi nile di n'uwa ikpe n'izi-ezi.
9. Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu,Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà;
10. Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi;N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.
11. Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion:Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.
12. N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha:O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.
13. Merem amara, Jehova;Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì,Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu;
14. Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile:N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion,Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.