Abù Ọma 9:13-20 Bible Nso (IGBOB)

13. Merem amara, Jehova;Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì,Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu;

14. Ka m'we kọ akukọ otuto-Gi nile:N'ọnu-uzọ-ama nile nke ada Zaion,Ka m'ṅuria ọṅu na nzọputa-Gi.

15. Mba nile ọzọ emikpuwo n'olùlù ha mere:N'ub͕u nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha.

16. Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo:N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah

17. Ndi nēmebi iwu gālaghachi n'ala mọ,Bú mba nile ndi nēchezo Chineke.

18. N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka agēchezọ ob͕eye,Olile-anya nke ndi di ume-ala n'obi agaghi-ala n'iyì rue mb͕e ebighi-ebi.

19. Bilie, Jehova; ekwela ka madu di ike:Ka ekpe mba nile ikpe n'iru Gi.

20. Jehova, doro ha ihe-egwu:Ka mba nile mara na nání madu ka ha bu. Selah

Abù Ọma 9