Abù Ọma 89:38-47 Bible Nso (IGBOB)

38. Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju.I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè.

39. I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi:I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala.

40. I tiwawo ogige-ya nile;I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia.

41. Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe:Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta.

42. I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu;I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.

43. Ọzọ, I nēme ka ọnu mma-agha-ya laghachi azu,I meghi kwa ka o guzosie ike n'agha.

44. I mewo ka onwunwu-ọcha-ya kwusi,I tudawo kwa oche-eze-ya rue ala.

45. I bilatawo ubọchi nile ọ bu okorọbia:I werewo ihere kpuchie ya n'aru. Selah

46. Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēzobe onwe-gi ebighi-ebi?Rùe ole mb͕e ka ọnuma-Gi ganēre dika ọku?

47. Cheta otú mb͕e ndu mu onwem di nkpunkpu:Ọ̀ bu ihe-efu gini ka I kèworo umu madu nile nye?

Abù Ọma 89