Abù Ọma 89:27-37 Bible Nso (IGBOB)

27. Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam,Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.

28. Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem,Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi.

29. M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi,Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.

30. Ọ buru na umu-ya arapu iwum,Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile;

31. Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ,Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;

32. M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha,Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.

33. Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem,M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.

34. M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ,Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.

35. Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi;M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;

36. Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi,Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.

37. Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi;Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah

Abù Ọma 89