24. Ma ikwesi-ntukwasi-obim na eberem gādi n'aru ya:Ọ bu kwa n'aham ka mpi-ya gādi elu.
25. M'gēdo kwa aka-ya n'oké osimiri,Do kwa aka-nri-ya n'osimiri nile.
26. Onye ahu gākpọm, si, Nnam ka I bu,Chinekem, na oké nkume nke nzọputam.
27. Ọzọ, Mu onwem gēme ya ọkparam,Onye kachasi ihe nile elu n'ebe ndi-eze nke uwa nọ.
28. Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēdebere ya eberem,Ọb͕ub͕a-ndum gēkwesi-kwa-ra ya ntukwasi-obi.
29. M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi,Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.
30. Ọ buru na umu-ya arapu iwum,Ghara kwa ijeghari n'ikpém nile;
31. Ọ buru na ha eme ka ukpurum nile ghara idi nsọ,Ọ buru kwa na ha edebeghi ihe nile M'nyere n'iwu;
32. M'gēwere kwa nkpa-n'aka leta njehie-ha,Were kwa ihe-otiti leta ajọ omume-ha.
33. Ma M'gaghi-esi n'ebe ọ nọ mebie eberem,M'gaghi-ekwu kwa okwu-ugha megide ikwesi-ntukwasi-obim.
34. M'gagh-eme ka ọb͕ub͕a-ndum ghara idi nsọ,Ọzọ, M'gagh-agbanwe ihe siworo n'eb͕ub͕ere-ọnum abua puta.
35. Otù ub͕ò ka M'jiworo idi-nsọm ṅua iyi;M'gaghi-agwa Devid okwu-ugha ma-ọli;
36. Nkpuru-ya gādiru mb͕e ebighi-ebi,Oche-eze-ya gādi kwa ka anyanwu n'irum.
37. Dika ọnwa ka o gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi;Ọzọ, Onye-àmà Nke nọ na mbara-ígwé kwesiri ntukwasi-obi. Selah
38. Ma Gi onwe-gi achipuwo, ju kwa aju.I wesabigawo onye-Gi etere manu iwe ókè.
39. I sọwo ọb͕ub͕a-ndu nke orù-Gi oyi:I mewo ka okpu-eze-ya ghara idi nsọ ọbuná rue ala.
40. I tiwawo ogige-ya nile;I mewo ka ebe-ya nile ewusiri ike buru ihe dapiara adapia.
41. Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ apunarawo ya ihe:Ọ ghọworo ndi-ab͕ata-obi-ya ihe-ita-uta.
42. I mewo ka aka-nri nke ndi nākpab͕u ya di elu;I mewo ka ndi-iro-ya nile ṅuria.