Abù Ọma 88:11-17 Bible Nso (IGBOB)

11. Àgākọ akukọ ebere-Gi n'ílì?Àgākọ akukọ ikwesi-ntukwasi-obi-Gi n'ebe-ila-n'iyì?

12. Àgāmara oké ọlu-Gi n'ọchichiri?Àgāma kwa ezi omume-Gi n'ala nchezọ-ihe?

13. Ma mu onwem, ọ bu Gi ka m'tikuworo, Jehova,Ọ bu kwa n'ututu ka ekperem gēje izute Gi.

14. Jehova, n'ìhi gini ka I nāju nkpuru-obim?N'ìhi gini ka I nēzonarim iru-Gi?

15. Onye ewedara n'ala na onye nēkubi ume ka m'bu site na nwata:Eburuwom oké ujọ Gi nile, obim nālọ miri.

16. Iwe-Gi di ọku agabigawo n'isim;Ihe-egwu-Gi nile ekpochapusiwom.

17. Ha dim buruburu dika miri ogologo ubọchi nile;Ha ab͕awom buruburu n'otù.

Abù Ọma 88