9. I doziri ọnọdu n'iru ya,O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu.
10. Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile,Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke.
11. Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri,Wasa kwa ome-ya rue Osimiri.
12. N'ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile,Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ we ghọrọ nkpuru-ya?
13. Ezì nke si n'oké ọhia puta nātakwosi ya,Anu nke nēnughari n'ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya.
14. Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi:Si n'elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a,
15. Na ogwe-osisi nke aka-nri-Gi kuworo,Lekwasi kwa ngalaba nke I mere ka o nwere Gi ume.
16. Esurewo ya n'oku, eb͕utuwo ya:Site n'ibasi-nba-ike nke iru-Gi ha nāla n'iyì.
17. Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi,N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume.
18. Ayi agaghi-esi kwa n'ebe I nọ laghachi azu:Me ka ayi di ndu, ọ bu kwa aha-Gi ka ayi gākpọku.