Abù Ọma 80:3-8 Bible Nso (IGBOB)

3. Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.

4. Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi?

5. I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri,I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku.

6. I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ilu-ọ̀gù:Ndi-iro-ayi nāchì kwa ọchì n'etiti onwe-ha.

7. Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata;Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.

8. I si n'Ijipt ropu osisi vine:I nāchupu mba di iche iche, we kua ya.

Abù Ọma 80