3. Chineke, me ka ayi lata; Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.
4. Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha,Rùe ole mb͕e ka iwe-gi gākwu anwuru imegide ekpere ndi-Gi?
5. I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri,I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku.
6. I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ilu-ọ̀gù:Ndi-iro-ayi nāchì kwa ọchì n'etiti onwe-ha.
7. Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata;Me kwa ka iru-Gi mua, ewe zọputa ayi.
8. I si n'Ijipt ropu osisi vine:I nāchupu mba di iche iche, we kua ya.
9. I doziri ọnọdu n'iru ya,O we b͕amie nkpọrọgwu, we juputa ala ahu.
10. Ejiri ǹdò-ya kpuchie ugwu nile,Ngalaba-ya di kwa ka osisi cedar nke Chineke.
11. Ọ nāwasa alaka-ya rue oké osimiri,Wasa kwa ome-ya rue Osimiri.
12. N'ìhi gini ka I tiwaworo ogige-ya nile,Ndi nile nke nāgabiga n'uzọ we ghọrọ nkpuru-ya?
13. Ezì nke si n'oké ọhia puta nātakwosi ya,Anu nke nēnughari n'ọhia nēwere kwa ya izù onwe-ya.
14. Chineke nke usu nile nke ndi-agha, biko, laghachikute ayi:Si n'elu-igwe legide anya, hu, leta kwa osisi vine a,