1. Jehova, Onye-nwe-ayi,Le otú aha-Gi di ebube n'uwa nile!Gi Onye tiyeworo ebube-Gi n'elu ígwé.
2. I siwo n'ọnu umu-ntakiri na umu nāṅu ara tọ ntọ-ala ike,N'ihi ndi-nkpab͕u-Gi,Ime ka onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀ kwusi.
3. Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi,Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo;