Abù Ọma 79:4-9 Bible Nso (IGBOB)

4. Ayi aghọworo ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,Ghọ-kwa-ra ndi di ayi buruburu ihe-ichì-ọchì na ihe-ikwa-emò.

5. Rùe ole mb͕e, Jehova, ka I ganēwe iwe rue mb͕e ebighi-ebi?Ekworo-Gi, ọ̀ ganēre dika ọku?

6. Wukwasi mba nile ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi,Wukwasi kwa ala-eze nile nke nākpọkughi aha-Gi.

7. N'ihi na ha eripiawo Jekob,Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.

8. Echetala ajọ omume nile nke ndi-mbu-ayi imegide ayi:Kwe ka obi-ebere-Gi nile me ngwa izute ayi:N'ihi na ayi enweghi ike ma-ọli.

9. Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi:Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.

Abù Ọma 79