Abù Ọma 78:62-65 Bible Nso (IGBOB)

62. O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha;Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.

63. Ọku ripiara umu-okorọbia-ha;Etoghi kwa umu-ab͕ọghọ-ha nāmaghi nwoke n'abù ọlulu-di.

64. Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha;Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.

65. Onye-nwe-ayi we teta dika onye nāraru ura,Dika dike nke nēti nkpu nke-uku site na manya-vine.

Abù Ọma 78