5. Echèrem èchìchè bayere ubọchi nile nke mb͕e ochie,Bú arọ nke mb͕e nile ebighi-ebi gara aga, si,
6. M'gēcheta abù m'nābù n'ikpọ ubọ-akwara n'abali:M'gēso obim tughari uche;Mọm we chọsie ike, si,
7. Ọ̀ bu rue mb͕e nile ebighi-ebi ka Onye-nwe-ayi gāju aju?Ọ̀ bu na ihem agaghi-atọ kwa Ya utọ ọzọ?
8. Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo?Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile?
9. Ọ̀ chezọwo ime amara, bú Chineke?Ò kpuchitawo obi-ebere-Ya nile n'iwe? Selah
10. M'we si, Ọriam ka nka bu;Ma m'gēcheta arọ nile nke aka-nri nke Onye kachasi ihe nile elu.
11. M'gēhota omume nile nke Ja;N'ihi na m'gēcheta oké ọlu-Gi nile site na mb͕e ochie.
12. M'gātughari kwa uche n'ọlu-Gi nile,Ọ bu kwa n'omume-Gi nile ka m'gātughari obi.
13. Chineke, n'idi-nsọ ka uzọ-Gi di:Ònye bu chi uku dika Chineke?
14. Gi onwe-gi bu Chineke Nke nālu oké ọlu:I mewo ka amara ike-Gi n'etiti ndi nile di iche iche.