Abù Ọma 75:2-7 Bible Nso (IGBOB)

2. Mb͕e m'gānara mb͕e akara àkà,Mu onwem gēkpe ikpe ziri ezi.

3. Ndi gbazeworo agbaze ka uwa na ndi nile ndi bi nime ya bu:Mu onwem atùwo ogidi nile ya. Selah

4. Asirim ndi nānya isi, Unu anyala isi:Asi-kwa-ram ndi nēmebi iwu, Unu ebulila mpi elu:

5. Unu ebulila mpi-unu rue ebe di elu;Unu ejila olu kwesiri ike kwue oké okwu.

6. N'ihi na ọ bughi n'Ọwuwa-anyanwu, ma-ọbu n'Ọdida-anyanwu,Ọ bughi kwa n'ọzara, ka nbuli-elu nēsi bia.

7. Kama Chineke bu onye-ikpe: Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu.

Abù Ọma 75