Abù Ọma 71:3-12 Bible Nso (IGBOB)

3. Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m'gābà nime ya mb͕e nileI nyewo iwu izọputam;N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu.

4. Chinekem, me ka m'b͕apu n'aka onye nēmebi iwu,N'ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike.

5. N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova:Gi bu ntukwasi-obim site na nwata.

6. N'elu Gi ka m'dabeworo site n'afọ nnem:Gi onwe-gi bu onye weputaworom n'afọ nnem:Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile.

7. Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube;Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike.

8. Ọnum gējuputa n'otuto-Gi,Ogologo ubọchi nile ka ọ gējuputa kwa n'ima-nma-Gi.

9. Etufulam na mb͕e agadi;Mb͕e ikem gwusiri arapulam.

10. N'ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem;Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù,

11. Si, Chineke arapuwo ya:Chuanu ya, jide ya; n'ihi na ọ dighi onye-nnaputa di.

12. Chineke, anọlam ebe di anya:Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka.

Abù Ọma 71