20. Gi, Onye meworo ka ayi hu ọtutu nkpab͕u nke jọ-kwa-ra njọ,I gēme ka ayi di kwa ndu ọzọ,Me kwa ka ayi si n'ob͕u-miri nile nke uwa rigoputa ọzọ.
21. Me ka idi-ukum bakari uba,Gi chighari kwa kasiem obi.
22. Mu onwem gēji kwa une kele Gi,Bú ezi-okwu-Gi, Chinekem:M'gēji ubọ-akwara bùkue Gi abù ọma,Gi Onye Nsọ nke Israel.