Abù Ọma 71:2-6 Bible Nso (IGBOB)

2. N'ezi omume-Gi naputam, me ka m'b͕apu:Tọrọm nti-Gi n'ala, zọputam.

3. Ghọrọm oké nkume nke ebe-obibi, nke m'gābà nime ya mb͕e nileI nyewo iwu izọputam;N'ihi na nkumem di elu na ebem ewusiri ike ka I bu.

4. Chinekem, me ka m'b͕apu n'aka onye nēmebi iwu,N'ọbu-aka nke onye nēme ajọ omume nke nēme kwa ihe-ike.

5. N'ihi na Gi onwe-gi bu olile-anyam, Onye-nwe-ayi Jehova:Gi bu ntukwasi-obim site na nwata.

6. N'elu Gi ka m'dabeworo site n'afọ nnem:Gi onwe-gi bu onye weputaworom n'afọ nnem:Na Gi ka otutom gādi mb͕e nile.

Abù Ọma 71