Abù Ọma 71:10-17 Bible Nso (IGBOB)

10. N'ihi na ndi-irom ekwuwo okwu bayerem;Ọzọ, ndi nēche nkpuru-obim nche ab͕aritawo ìzù,

11. Si, Chineke arapuwo ya:Chuanu ya, jide ya; n'ihi na ọ dighi onye-nnaputa di.

12. Chineke, anọlam ebe di anya:Chinekem, bia ọsọsọ iyerem aka.

13. Ka ihere me ha, ka eme kwa ka ha gwusia, bú ndi nēmegide nkpuru-obim;Ka ewere ita-uta na ọnọdu-ihere kpuchie ndi nāchọ imem ihe ọjọ.

14. Ma mu onwem, mb͕e nile ka m'ganēche Gi,We tukwasi otuto n'otuto-gi nile

15. Ọnum gākọ akukọ bayere ezi omume-Gi,Ogologo ubọchi nile ka ọ gākọ akukọ bayere nzọputa-Gi;N'ihi na amaghm ọnu-ọgugu nile ha.

16. M'gēji idi-ike nile nke Onye-nwe-ayi, bú Jehova, bia:M'gēhota ezi omume-Gi, nání nke Gi.

17. Chineke, I zíwom ihe site na nwata;Ọ bu kwa rue ub͕u a ka m'nēgosi oké ọlu-Gi nile.

Abù Ọma 71