Abù Ọma 7:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru;Ka ọ zọda kwa ndum n'ala,Me ka nsọpurum biri n'ájá. Selah

6. Bilie, Jehova, n'iwe-Gi,Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um:Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.

7. Ka nzukọ nke ndi nile di n'uwa di kwa Gi buruburu:Gi laghachi kwa n'ebe di elu n'elu ya.

8. Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe:Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.

9. Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike:N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.

10. Ọtam dikwasi na Chineke,Bú Onye nāzọputa ndi obi-ha ziri ezi.

Abù Ọma 7