2. Ka ọ ghara idọka nkpuru-obim dika ọdum,Nētipia ya, mb͕e onye-nnaputa adighi.
3. Jehova, bú Chinekem, ọ buru na emewom nka;Ọ buru na ajọ omume di n'ọbu-akam abua;
4. Ọ buru na enyeghachiwom onye mu na ya di n'udo ihe ọjọ;(Kama nke ahu, adọputawom onye nākpab͕um n'efu:)
5. Ka onye-iro chua mkpuru-obim, rue ya aru;Ka ọ zọda kwa ndum n'ala,Me ka nsọpurum biri n'ájá. Selah
6. Bilie, Jehova, n'iwe-Gi,Welie Onwe-gi elu imegide nrubiga-ókè-iwe nke ndi nākpab͕um:Teta-kwa-ram; I nyewo ikpé iwu.