Abù Ọma 68:7-15 Bible Nso (IGBOB)

7. Chineke, mb͕e I putara ga n'iru ndi-Gi,Mb͕e I zọbigara ije n'ala tọb͕ọrọ n'efu; Selah

8. Ala mara jijiji,Ọzọ, elu-igwe buru miri n'iru Chineke:Sainai ahu mara jijiji n'iru Chineke, bú Chineke nke Israel.

9. Miri-ozuzo, bú onyinye-afọ-ofufo, ka I nēfesa, Chineke,Mb͕e ike gwuru ihe-nketa-Gi, Gi onwe-gi mere ka o guzosie ike.

10. Usu ndi nke Gi ebiriwo nime ya:I nēdoziri ndi ewedara n'ala ihe n'idi-nma-Gi, Chineke.

11. Onye-nwe-ayi nēnye okwu:Ndinyom ndi nēzisa ozi ahu bu usu bara uba.

12. Ndi-eze nke usu nile nke ndi-agha nāb͕alaga, ha nāb͕alaga:Nwayi bi n'ulo nēkèsa kwa ihe akwatara n'agha.

13. Ọ buru na unu edina n'etiti ogige-aturu,Ma ọ di ka nkù abua nke nduru nke ejiworo ọla-ọcha kpuchie,Ejiwo kwa ọla-edo ọma nēnwu akwukwọ ndu akwukwọ ndu kpuchie nkù-ya abua.

14. Mb͕e Onye Nke puru ime ihe nile chusara ndi-eze nime ya,Snow nēzò na Zalmon.

15. Ugwu Chineke ka ugwu Beshan bu;Ugwu nwere ugwu di iche iche n'elu ya ka ugwu Beshan bu.

Abù Ọma 68