1. Ka Chineke bilie, ka ndi-iro-Ya b͕asa;Ka ndi nākpọ Ya asì si n'iru Ya b͕alaga.
2. Dika ifufe si efesa anwuru-ọku, otú a ka I gēfesa ha:Dika wax si ab͕azepu n'iru ọku,Otú a ka ndi nēmebi iwu gēsi n'iru Chineke la n'iyì.
3. Ma ka ndi ezi omume ṅuria; ka obi tọ ha utọ n'iru Chineke:E, ka ha wulie elu n'ọṅù.
4. Bùkuenu Chineke abù, bùkuenu aha-Ya abù ọma:Tulierenu Ya uzọ, bú Onye nānọkwasi inyinya gabiga n'ala ihe nādighi;Aha-Ya bu JA; ṅuri-kwa-nu ọṅu-agha n'iru Ya.