Abù Ọma 64:5-10 Bible Nso (IGBOB)

5. Ha nēme okwu ọjọ ka ọ diri ha ike;Ha nākọ akukọ bayere isi ọnyà na nzuzo;Ha siri, Ònye gāhu ha?

6. Ha nāchọputa ajọ omume nile, si, Ayi emezuwo nchọputa achọputara nke-ọma:Ọzọ, èchìchè-ime nke madu ọ bula nime ha na obi-ya miri emi.

7. Ma Chineke nāb͕a ha àkú;Na mberede ka ntib͕u nile ha bu.

8. Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha:Ha nēfufe isi, bú onye ọ bula nke nēlekwasi ha anya.

9. Madu nile gātu kwa egwu;We gosi ọlu Chineke,Were uche chè èchìchè bayere omume-Ya.

10. Onye ezi omume gāṅuri na Jehova, b͕abà kwa nime Ya;Ndi nile ndi ziri ezi n'obi gānya kwa isi.

Abù Ọma 64