Abù Ọma 61:1-6 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke, nuru olu iti-nkpum;Ṅa nti ekperem.

2. M'nēsi na nsọtu uwa kpọkue Gi, mb͕e, obim nādighi ike:Rue n'oké nkume nke kam elu ka I gēdurum je.

3. N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà,Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro.

4. Ka m'nọ dika ọbìa n'ulo-ikwū-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi:M'gāb͕abà n'ebe-nzuzo nke nkù-Gi abua. Selah

5. N'ihi na Gi onwe-gi, Chineke, egewo nti nkwa nile m'kwere:I werewo ihe-nnweta nke ndi nātu egwu aha-Gi nye ha.

6. I gātukwasi ọtutu ubọchi n'ubọchi ndu eze:Arọ-ya nile gādi ka ọtutu ọb͕ọ.

Abù Ọma 61