Abù Ọma 60:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi,I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ.

2. I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya:Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu.

3. I mewo ka ndi-Gi hu ihe siri ike:I mewo ka ayi ṅua manya nke isu-ngọngọ.

4. I nyewo ndi nātu egwu Gi ọkọlọtọ,Ka ewe welie ya elu dika ọkọlọtọ n'ihi ezi-okwu. Selah

Abù Ọma 60