Abù Ọma 58:4-10 Bible Nso (IGBOB)

4. Edide ha nwere yiri edide agwọ:Ha di ka aju-ala nke nti chiri nke nākpọchi nti-ya;

5. Nke nādighi-ege nti olu nke ndi nārà agwọ,Ma-ọbu nke dibia nārafu arafu, bú onye emeworo ka ọ mara ihe.

6. Chineke, tijie ezé nile ha n'ọnu-ha:Tikwopu ezé uku nile nke umu-ọdum, Jehova.

7. Ka ha b͕aze dika miri nke nērùghariri onwe-ya:Mb͕e o nēdo àkú-ya nile, ka ha di ka anēbipu ọnu-ha.

8. Ka ha di ka ejula nāga nāb͕aze,Dika nwa nwanyi mukworo amukwo, dika ndi ọ dighi mb͕e ha huru anyanwu.

9. Tutu ite-unu amata ọku ogwu,Ma ihe di ndu ma ihe di ọku, Ọ nēfepusi ha ike dika oké ifufe.

10. Onye ezi omume gāṅuri mb͕e ọ huru ọ́bọ̀ ahu:Ọ gāsa nzọ-ukwu-ya nile n'ọbara onye nēmebi iwu.

Abù Ọma 58