8. M'gēwere ọsọsọ si n'ifufe siri ike na n'oké ifufeBiarue ebe-nb͕apu dirim.
9. Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha:N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.
10. N'ehihie na abali ka ha nāb͕a ya buruburu n'elu mb͕idi-ya nile:Ma ajọ ihe ma nmeb͕u di n'etiti ya.
11. Ihe-ila-n'iyì di iche iche di n'etiti ya:Nzọb͕u na aghughọ adighi-esi kwa n'amá-ya nile.
12. N'ihi na ọ bughi onye-iro nātam uta;M'gānagide kwa ya:Ọ bughi onye nākpọm asì mere onwe-ya uku megidem;M'gēzonari kwa ya onwem:
13. Kama ọ bu gi onwe-gi, onye mu na gi ra,Eyìm, na onye m'mara nke-ọma.
14. Ayi nāb͕akọri ìzù utọ,N'ulo Chineke ka ayi nējeghari n'etiti ìgwè madu.
15. Ka ọnwu biakwasi ha na mberede,Ka ha ridarue ala-mọ na ndu:N'ihi na ihe ọjọ nile di n'ebe ha nọ dika ọbìa, n'etiti ha.
16. Ma mu onwem, Chineke ka m'gākpọku;Jehova gāzọputakwam.
17. Anyasi, na ututu, na etiti-ehihie, ka m'gātughari uche, su kwa oké ude:Ọ gānu kwa olum.
18. Ọ b͕aputawo nkpuru-obim me ka ọ ba n'udo, ka ha ghara ibiarum nso:N'ihi na ha bara uba, bú ndi mu na ha nālu ọ̀gù.
19. Chineke gānu olum, weda kwa ha n'ala,Bú Onye nānọdu ka eze site na mb͕e ochie. SelahHa bu ndi nēnweghi nb͕anwe,Ha adighi-atu kwa egwu Chineke.