Abù Ọma 51:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. Zopu iru-Gi na nmehiem nile,Hichapu kwa ajọ omumem nile.

10. Kèrem obi di ọcha, Chineke;Me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhu nimem.

11. Atupulam n'iru Gi;Anara-kwa-lam Mọ Nsọ Gi.

12. Nyeghachim obi-utọ nke nzọputa-Gi:Were kwa mọ nke amara aha-ya kwagidem.

13. M'gēzí ndi-njehie uzọ-Gi nile;Ndi-nmehie gālaghachikute kwa Gi.

14. Naputam n'aka ikpe-ọmuma ọbara di iche iche, Chineke, bú Chineke nke nzọputam;Irem gēti nkpu ọṅù bayere ezi omume-Gi.

15. Onye-nwe-ayi, I gēmeghe eb͕ub͕ere-ọnum abua;Ọnum gēgosi kwa otuto-Gi.

16. N'ihi na àjà adighi-atọ Gi utọ; ka m'we nye ya:Àjà-nsure-ọku adighi-atọ Gi utọ.

17. Àjà nile nke Chineke bu mọ tiwara etiwa:Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I dighi-eleda ya anya.

18. Mere Zaion nma dika o si di Gi utọ:I gālu mb͕idi nile nke Jerusalem.

Abù Ọma 51