Abù Ọma 50:9-16 Bible Nso (IGBOB)

9. M'gaghi-anara oke-ehi n'ulo-gi,M'gaghi-anara nkpi ọ bula n'ogige-ewu-na-aturu-gi.

10. N'ihi na Mu nwe anu-ọhia ọ bula nke oké ọhia,Ya na anu nile n'elu nnù ugwu abua na ọgu iri.

11. Amawom anu-ufe ọ bula nke ugwu nile:Anu nile nke nēnughari n'ọhia di kwa n'akam.

12. Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi:N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.

13. M'gēri anu oke-ehi?Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?

14. Chuara Chineke ekele dika àjà;Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:

15. Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u;M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.

16. Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si,Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile?Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi?

Abù Ọma 50