Abù Ọma 50:13-22 Bible Nso (IGBOB)

13. M'gēri anu oke-ehi?Ọ̀ bu ọbara nkpi ka m'gāṅu?

14. Chuara Chineke ekele dika àjà;Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:

15. Kpọkukwam n'ubọchi nkpab͕u;M'gādọputa gi, i gāsọpu-kwa-ram.

16. Ma ndi nēmebi iwu ka Chineke gwara okwu, si,Òle ọlu-gi di ya n'ikọ ukpurum nile?Òle ọlu-gi di kwa ya na i būruwo ọb͕ub͕a-ndum n'ọnu-gi?

17. Ebe gi onwe-gi kpọworo idọ-aka-na-nti asì,We tufue okwum nile n'azu gi.

18. Ọ buru na i hu onye-ori, ihe-ya we tọ gi utọ,Gi na ndi nākwa iko ekèkọwo kwa òkè.

19. I rarawo ọnu-gi nye n'ikwu ihe ọjọ,Ire-gi nējikọta kwa aghughọ.

20. I nānọdu ala, nwa-nne-gi ka i nēkwu okwu megide;Nwa nke nne-gi muru ka i nēbo ebubo ugha.

21. Ihe ndia ka i meworo, M'we b͕a nkiti;I chère na adizum ka i di:M'gābara gi nba, do kwa ya n'usoro n'anya-gi.

22. Biko, ghọtanu nka, unu ndi nēchezọ Chineke,Ka m'we ghara idọka unu, ọ dighi kwa onye-nnaputa diri unu:

Abù Ọma 50