1. Nurunu nka, ndi nile di iche iche;Ṅanu nti, ndi nile bi n'uwa nka:
2. Ma ndi di ala ma ndi di elu,Ọgaranya na ob͕eye n'otù.
3. Ọnum gēkwu okwu amam-ihe nile;Ntughari-uche nke obim gābu kwa nghọta nile.
4. M'gātọ ntim n'ala n'ilu:M'gēkpughepu okwu-omimim n'ubọ-akwara.
5. N'ìhi gini ka m'gātu egwu n'ubọchi ihe ọjọ,Mb͕e ajọ omume nke ndi nējidem n'ikiri-ukwu dim buruburu,
6. Bú ndi nātukwasi obi n'àkù-ha,Nānya kwa isi n'iba-uba nke ọgaranya ha bu?
7. Ọ dighi onye ọ bula gāb͕aputa nwa-nne-ya ma-ọli,Ọ gaghi-enye Chineke ihe-nb͕aputa-ya:
8. (N'ihi na nb͕aputa nkpuru-obi-ha di oké ọnu-ahia,Ọ gāra kwa ya aka rue mb͕e ebighi-ebi:)
9. Ka o we digide ndu rue mb͕e ebighi-ebi,Ghara ihu nbibi anya.
10. N'ihi na ọ gāhu ya: ndi-amam-ihe gānwu,N'otù ka onye-nzuzu na onye bu anu-ọhia nālakọ n'iyì,We rapuru ndi ọzọ àkù-ha.
11. Èchìchè-obi-ha bu, na ulo-ha gādiru mb͕e ebighi-ebi,Ebe-obibi-ha rue ọb͕ọ nile;Ha ewerewo aha-ha kpọkwasi ala nile ha.