Abù Ọma 47:1-4 Bible Nso (IGBOB)

1. Unu ndi nile di iche iche, kuanu aka;Werenu olu nke iti-nkpu-ọṅu tikue Chineke.

2. N'ihi na Jehova, Onye kachasi ihe nile elu, di egwu;Ọ bu Eze uku nāchi uwa nile.

3. Ọ nēdu ndi nile di iche iche bia n'okpuru ayi,Ọ nēdu kwa mba nile bia n'okpuru ukwu-ayi.

4. Ọ nārọputara ayi ihe-nketa-ayi,Bú nbili-elu nke Jekob, onye Ọ huru n'anya. Selah

Abù Ọma 47