1. Obim ab͕ọputawo okwu di nma:Mu onwem nēkwu okwu; olum diri eze:Irem bu pen nke onye nēde akwukwọ ngwa ngwa.
2. Emewo gi ka i ma nma kari umu madu;Awukwasiwo amara n'eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua:N'ihi ya Chineke agọziwo gi rue mb͕e ebighi-ebi.
3. Ke mma-agha-gi n'úkwù-gi, gi dike,Ebube-gi na ima-nma-gi.