6. Àjà na onyinye-inata-iru-ọma adighi-atọ Gi utọ;Nti abua ka I ràpúworom:Ọ bughi àjà-nsure-ọku na àjà-nmehie ka I chọworo.
7. Mb͕e ahu ka M'siri, Le, abiawom;N'akwukwọ-npiakọta ka edeworo ihe bayerem:
8. Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke;Iwu-Gi di kwa nime obim.
9. Ezisawom ozi ọma nke ezi omume nime nkpọkọta-Gi bara uba;Le, adighm-eb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnum abua,Jehova, Gi onwe-gi amawo.